AHU KRISTI BU SO MMA by Rev. J.B. Akam — Lyrics

Rev. J.B. Akam Igbo Communion Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Ahụ Kristi bụ sọ mma bịakwute m Ọbara Kristi nke eji gbapụta ụwa. VERSE 1 Ọ bụ sọ ndị n'eburọ njọ n'obi Bụ ndị nwere ike inata Ya n'obi aṅụrị. VERSE 2 Ndị nile natara Jesu n'obi Ma ha bukwe njọ ogbugbu n'obi dakwara iwu. VERSE 3 Onye naanata Jesu n'obi dị mma Gaenwe aṅụrị n'enwerọ ube n'ụwa ọzọ. VERSE 4 Onye natara Jesu gaadị umeala Ọ gaadị ọcha pụrụ iche n'ime obi ya. VERSE 5 Ekworo, anya ukwu, na ọbọ Nna wepụ N'obi ndị nile natara Jesu Kristi. VERSE 6 K'anyị zere iwu nile Nna tiiri N'iwu nile nke Nzukọ na nke obodo. VERSE 7 Makana iwu nile si n'eluigwe bịa Ka nke Nzukọ ka nke obodo tiiri anyị.

Download the sheet music

AHU KRISTI BU SO MMA

AHU KRISTI BU SO MMA

By Rev. J.B. Akam
Solfa
Igbo
2 pages
35 Downloads
Communion Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want