Full Lyrics
CHORUS
Ahụ Kristi bụ sọ mma bịakwute m
Ọbara Kristi nke eji gbapụta ụwa.
VERSE 1
Ọ bụ sọ ndị n'eburọ njọ n'obi
Bụ ndị nwere ike inata Ya n'obi aṅụrị.
VERSE 2
Ndị nile natara Jesu n'obi
Ma ha bukwe njọ ogbugbu n'obi dakwara iwu.
VERSE 3
Onye naanata Jesu n'obi dị mma
Gaenwe aṅụrị n'enwerọ ube n'ụwa ọzọ.
VERSE 4
Onye natara Jesu gaadị umeala
Ọ gaadị ọcha pụrụ iche n'ime obi ya.
VERSE 5
Ekworo, anya ukwu, na ọbọ Nna wepụ
N'obi ndị nile natara Jesu Kristi.
VERSE 6
K'anyị zere iwu nile Nna tiiri
N'iwu nile nke Nzukọ na nke obodo.
VERSE 7
Makana iwu nile si n'eluigwe bịa
Ka nke Nzukọ ka nke obodo tiiri anyị.