Full Lyrics
REFRAIN
Abụ m achịcha si n'igwe, si n'eligwe bịa.
Abụ m achịcha n'enye ndụ n'ime nmụọ.
Ahụ n'ọbara m ka m ji wee chụọ aja n'elu obe maka gị.
Nara, rie. Onye bịakwutere m, agụụ agagh'agụ y'ọzọ.
Onye kwere na m, akpịrị agagh'akpọ ya nkụ.
Aga m'ekulite mkpụl'obi ya, n'ụbọchị ikpeazụ.
VERSE 1
Achịcha m g'enye bụ maka ndụ nk'ụwa.
Onye ọbụla nke riri achịcha nke a,
ọ g'adị ndị okpu.
Ọ g'adị ndụ, ndụ ebigh'ebi.
VERSE 2
Beelu sọ m'irir'ahụ nke Nwa nke mmadụ,
beelu sọ m'inur'ọbara Ya,
ị gagh'enwenata ndụ n'ime gị.
N'ezie, ọ bụ Dinwenu n'ekwu.
VERSE 3
Abụ m mbilite n'ọnwụ, abụ m ndụ.
Onye kwere na m, ọbụrụgodu n'ọnwụr'anwụ,
ọ g'adị ndị okpu.
Ọ g'adị ndụ, ndụ ebigh'ebi.