O, DINWENU JESU KRISTI by Emma Bronike — Lyrics

Emma Bronike Igbo Consecration Celebrations Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN O Dinwenu Jesu Kristi, kwuba akara nke nzoputa n'ebe a, ewe na ka nmuo n'enye ahuhu bata n'ime ya. VERSE 1 Onye ukwu ka Oseburuwa bu, O bu kwa Onye ana eto nke ukwu n'obodo Chineke anyi. N'ugwu nso Ya ihe mara mma n'idi elu na ihe obi uto nk'uwa nile. VERSE 2 Ka n'ugwu Zion na akuku nile nke ugwu bu obodo Eze ukwu, Chineke nke no n'ulo nso Ya di elu, Emego ka amara na Ya no n'ulo elu. VERSE 3 N'ihi na lee Ndieze zukoro, ha gabigara n'otu ha, ha mara jijiji ha were wara oso. VERSE 4 Omajijiji jidere ha n'ebe ahu, ha na atughario n'ime ha dika nwanyi n'amu puta nwa. O bu aguifufe nke owuwa anyanwu tiwara ugbo nile nke Thashish. VERSE 5 Ihe anyi nugura bu ihe anyi nugara n'onwe anyi, n'obodo nke Chineke, Obodo Oseburuwa nk'igwe ndi agha. VERSE 6 Chineke anyi na eche maka ihun'anya Gi n'ime ulo uka Gi. Dika aha Gi siri di O Chineke, Otu ahu ka otito Gi di wee ruo uwa tuwa nile. VERSE 7 Mmeri di n'aka nri Gi. Ugwu Zion n'anurio nu, Umuada Juda n'ete egwu anuri maka ikpe ikpe oma Gi nile.

Download the sheet music

O, DINWENU JESU KRISTI

O, DINWENU JESU KRISTI

By Emma Bronike
Solfa
Igbo
1 page
1 Downloads
Consecration Celebrations Hymns
0 0

More lyrics you may want