Full Lyrics
VERSE 1
Chukwu Nwa si n'igwe
bịa n'ime ụwa nkea
we ghọ achịcha dị ndụ
na mmanya dị oke ọnụ, Ọ sịrị:
CHORUS
Nara num rie, nara num rie ahụ mo, ahụ mo.
Nara num nụọ, nara num nụọ ọbara mu, ọbara mo.
Otito dịrị ya, otito dịrị ya, otito dịrị ya, dịrị ya, dịrị ya.
VERSE 2
Jesu kwere anyị nkwa
Onye chọrọ ịdị ndụ
Nata ahụm na ọbaram
Ị ga enwe nzọpụta, Ọ sịrị:
VERSE 3
Ndị ụmụazụ Jesu
Gbasara ozi ọma nkea
N'ime ụwa nile
Okwu Jesu na olu, Ọ sịrị:
VERSE 4
Ngọzị kam na enye unu
Na emenu ihe nkea
Site na ụbọchị ta,
ruo mgbe ebigh ebi, Ọ sịrị: