CHIZITEREM by Ezeokeke Blaisemartins — Lyrics

Ezeokeke Blaisemartins Igbo Celebrations Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Chizitere mo, ihe mmad'uwa woro mo Akwa mgbochi e tiwara shim, tere m'egwu m buru chi n'elu Abum onye wa agam ako akuko maka Chukwu n'echerem e chiche oma eh Ebe mkpofu ntu akwa mgbochi e k'ochetaram bia tiwara eh Ezege chakela eh, um'uwa wee juba m si juba, juba Ob' agha k'osi me i me Ya ihe m ma bu chim hurum n'anya ih'ebube mela Tobenu Chineke lebe Mela k'anyi tobe chi oge chi kam ya ih'ebube ma Mela tobenu Chineke, ih'ebube kelebe Mela k'anyi tobe chi oge chi kam ya chi ji nma Onye mmeri ewo du Odegwu du mo na tobenu Chukwu nke ra na toben Mo onye Otego mgbe m na Uchenna g'e kwur'okwu na Jerusa sinyer'ekel'a n'ume Lem yaga sekwu papa tobenu Chineke Mezue na Capa bia ribe Nnam kelebe Nium uwa were ohe la eh chi oge chi kam tibe uwa were mkpu oṅu na ma Kpoba mkpu n'ok'o fiokwa ebe nine tobenu Chukwu nlu tio lo lo lo ndi ekwe ekwe n'e na toben Lo lo kwe n'ute kwere na Uchenna g'e o lo lo lo o tio lo lo lo me Lo lo lo tobenu Chineke o lo lo lo o lo lo lo kelebe Lo Chi lo Chi lo Chi chi oge Chi kam ziterem ziterem ziterem m'o ziterem ihe oma ihe oma ihe oma ihe oma. [VERSE 1] Akuko maka ngozi Chukwu agam akao ya k'osi me Nkoroya Dimo, nkoroya Nwuyem, nkokwara y'umu umu mo Umu umu m g'akoro ya gaba ndudugandu ni le O bidoro kemgb' ebum n'afo okweghi nd' irom hum anya Mgb'a murum, e kurum, egberem igbe ma gbakw'oso ma m emelughi ahu Site na nwatam rue n'okenyem eh, afo oma y'enweghi nkocha Chizitere m ihe oma Ih' ebube emela. [VERSE 2] Ara guba nwa obere nne akwa nne nukwa akwa nwa onye nw' ara Akwa nderi m kwara ka Chukwu gechara mee mu mma Uwa lekwanu muo a gam esi agha kele Abu otito na ihe onyinye di mma kam buru butere Chukwu ewo Chizitere m ihe oma Ih' ebube emela. [VERSE 3] Chim huru m n'anya O n'enyem ihem yoro ya n'aka o Nyenu mmad'uwa ka onyenu mo i mara shi nkem ekpomekwe Tukwasi obi gi na Chukwu og'enye gi ihe I yoro ya o Buru nwa o g'ewere nye gi ya o Buru di o g'ewere nye gi ya o Buru ego o g'ewere gi ya tuo ya ite a ko mmanu Chim le Ite a ko mmanu Chiboke mo ite a ko mmanu do ko mmanu jim jim chiri gaba Oche nko mmanu Chiziterem ihe oma Ih'ebube emela. [SOLO] I ma, ihe awor'ogoli zuo n'ahia O na eri kw'onu Kedu kam g'esi ken'Olisa na Ngozi ya nile m Si kam koba a gam akocha? M si kam kwuba, a gam akwucha y'ugwo? O nwa nnem soro mo k'anyi tuoro ya mma mma Ony' omere mma bia soro mo k'anyi tuoro ya mma mma Onyere gi onu bia soro mo k'anyi tuoro ya mma mma Oborochi soro mo k'anyi tuoro ya mma mma Ndi onyer' ego bia soro mo k'anyi tuoro ya mma mma Ndi onyere nwa bia soro mo k'anyi tuoro ya mma mma Chiziterem ihe oma Ih'ebube emela.

Download the sheet music

CHIZITEREM

CHIZITEREM

By Ezeokeke Blaisemartins
Solfa
Igbo
4 pages
3 Downloads
Celebrations Hymns
0 0

More lyrics you may want