Full Lyrics
[INTRO]
Chukwu Nna aga m abịa kelee Gị o!
Maka n'agbanyeghị otu osiri dịrị mo!
Echekwubere m Gị Chukwu Nna mo!
[TENOR SOLO]
Oh Nwanne m! ngwa k'anyị jee!
Nwanne m! echegbuzil'onwe gị o
N'ime ọnọdụ ọbụla Chineke naadị ndụ
Ọ dị mma Ọ dị njọ Chineke nọ n'ọrụ oh!
Tụkwasị Chukwu obi; Emesịa n'Ọ gaadị mma
Were okwukwe na nchekwube jebe!
Chunyeere ya aja Nna biko Eguzom n'ihu Gị o Imo!
E be ọbụ Gị Oke nkume mo!
Onye ka m gaatụ egwu? Onye gaeyi m'egwu?
Papa biko biko ekwela ihere mee m;
Na Gị ka m gụgụọ m'obi emo;
Na Gị ka m Chekwubere.
[VERSE 1]
Ụmụ nnụnụ nk'igwe onye naelekọta ha?
Ọ kwa Gị Chukwu mara mkpa mo!
Ọ kwa Ị sị m'ọnụ wee sị m gab'atụn' ụjọ!
A ga m'abịa bute nye mo;
Maka na Echekwubere m Gị Chukwu Nna mo!
Echekwubere m Gị Chukwu Nna mo!
[LINK]
Echekwubere m Gị Chukwu!
Oh nwanne m ngwa k'anyị jee!
[VERSE 2]
Nna anyị Abraham chunyeere Gị aja nchekwube;
Nwaodibo Gị Ebel chunyeere Gị aja nchekwube;
Nwanyị Zarephat chunyeere Gị aja nchekwube;
Nwanyị isi mkpe chunyeere Gị aja nchekwube;
Nwa Gị Jesu chunyeere Gị aja nchekwube sị:
"Nna n'aka Gị ka m tinyere mmụọ m!"
Lezia nu mo! Asị m ka m bịa kelee Gị o
Maka na Echekwubere m Gị Chukwu Nna mo!
[VERSE 3]
Ekele ka m jiri bịa
Egwu ọyọrịma ka m jiri bịa oh
Ikele Gị maka nk' I mer' eme Chi mo!
Ito Gị maka nk' Ị ka gamekwa eme! Chi mo!
Chukwu baar' ebili mmiri mba Onye gar' ije n'elu mmiri Chi mo!
Atụkwasara m Gị obi n' Ị bụ Chi mo!
Maka na Echekwubere m Gị Chukwu Nna mo!