CHEKWUBECHUKWU by Fr. Bart C. Ezeokafor — Lyrics

Fr. Bart C. Ezeokafor Igbo Offertory Hymns Prayer Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[INTRO] Chukwu Nna aga m abịa kelee Gị o! Maka n'agbanyeghị otu osiri dịrị mo! Echekwubere m Gị Chukwu Nna mo! [TENOR SOLO] Oh Nwanne m! ngwa k'anyị jee! Nwanne m! echegbuzil'onwe gị o N'ime ọnọdụ ọbụla Chineke naadị ndụ Ọ dị mma Ọ dị njọ Chineke nọ n'ọrụ oh! Tụkwasị Chukwu obi; Emesịa n'Ọ gaadị mma Were okwukwe na nchekwube jebe! Chunyeere ya aja Nna biko Eguzom n'ihu Gị o Imo! E be ọbụ Gị Oke nkume mo! Onye ka m gaatụ egwu? Onye gaeyi m'egwu? Papa biko biko ekwela ihere mee m; Na Gị ka m gụgụọ m'obi emo; Na Gị ka m Chekwubere. [VERSE 1] Ụmụ nnụnụ nk'igwe onye naelekọta ha? Ọ kwa Gị Chukwu mara mkpa mo! Ọ kwa Ị sị m'ọnụ wee sị m gab'atụn' ụjọ! A ga m'abịa bute nye mo; Maka na Echekwubere m Gị Chukwu Nna mo! Echekwubere m Gị Chukwu Nna mo! [LINK] Echekwubere m Gị Chukwu! Oh nwanne m ngwa k'anyị jee! [VERSE 2] Nna anyị Abraham chunyeere Gị aja nchekwube; Nwaodibo Gị Ebel chunyeere Gị aja nchekwube; Nwanyị Zarephat chunyeere Gị aja nchekwube; Nwanyị isi mkpe chunyeere Gị aja nchekwube; Nwa Gị Jesu chunyeere Gị aja nchekwube sị: "Nna n'aka Gị ka m tinyere mmụọ m!" Lezia nu mo! Asị m ka m bịa kelee Gị o Maka na Echekwubere m Gị Chukwu Nna mo! [VERSE 3] Ekele ka m jiri bịa Egwu ọyọrịma ka m jiri bịa oh Ikele Gị maka nk' I mer' eme Chi mo! Ito Gị maka nk' Ị ka gamekwa eme! Chi mo! Chukwu baar' ebili mmiri mba Onye gar' ije n'elu mmiri Chi mo! Atụkwasara m Gị obi n' Ị bụ Chi mo! Maka na Echekwubere m Gị Chukwu Nna mo!

Download the sheet music

CHEKWUBECHUKWU

CHEKWUBECHUKWU

By Fr. Bart C. Ezeokafor
Solfa
Igbo
5 pages
2 Downloads
Offertory Hymns Prayer Hymns
0 0

More lyrics you may want