CHEKWABA MKPULUOBI M by D. Amusia — Lyrics

D. Amusia Igbo Prayer Lenten Hymns Burial / Funeral Hymns Communion Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Jesu chekwaba mkpụlụobi m o, Jesu chekwaba mkpụlụobi m n'ụlọ Gị doo. Ị gaghị ekwe ka mkpụlụobi m o ree ure, Ị gaghị ekwe ka mkpụlụobi m ree ure N'ala ndị mmụọ. VERSE 1 Mkpụlụobi Ị kere n'oyiyi Gị Jesu, Mkpụlụobi Ị kere n'ọdịdị anwụghị anwụ. Lee nụ k'ọ tọgbọrọ, lee nụ k'ọ guzoro, Jesu Ọ gaghị ere n'ata ure n'ili ọnwụ. VERSE 2 Chukwu ahapụghị nwa Ya k'ọ ree ure n'ili, Chukwu ahapụghị nwa Ya ka Ọ laa n'iyi. Chukwu meriri ili, mebie ọnwụ, mebie mmehie, Chekwaba obi m o n'ebe nsọ Gị. VERSE 3 Mgbe Ị g'akpọ ndị kwere ekwe n'ụda opi nke igwe, Mgbe Ị g'akpọ ha n'ọgbara ndị mbụzi. Cheta m oh Jesu, cheta m o, cheta mu, Abụ m onye kwere ekwe. VERSE 4 Onye iro bịara izuru, onye iro bịara ka o gbue, Ka o bibisia ụmụ nke Chukwu. Chi m o ekwela, Chukwu ekwela, Ka onye iro mkpụrụobi metụ m aka. Chukwu, Chukwu, Ka onye iro mkpụrụobi metụ m aka.

Download the sheet music

CHEKWABA MKPULUOBI M

CHEKWABA MKPULUOBI M

By D. Amusia
Solfa
Igbo
3 pages
3 Downloads
Prayer Lenten Hymns Burial / Funeral Hymns Communion Hymns Hymns
1 0

More lyrics you may want