Full Lyrics
REFRAIN
Biko Jesu, biko Jesu,
Ekwekwa la k'ụmụ Gị laa n'iyi.
VERSE 1
Gị bụ ike anyị, Gị bụ isindụ anyị,
Anyị naarịọ Gị Nna,
Jigide anyị, ekwekwa la k'anyị laa n'iyi.
VERSE 2
Ka ndị kwere na Gị nweta ngozi Gị n'uju,
Nye anyị ahụ ike n'ọganihu,
Udo n'ịhụnanya Gị.
VERSE 3
N'ebe anyị n'arụ ọrụ, n'ebe anyị n'azụ ahịa,
N'ebe anyị n'agụ akwụkwọ,
Chekwa b'anyị, ekwekwa la k'anyị laa n'iyi.
VERSE 4
Chekwa ndị nne n'nna, dube ha gozie ha,
Nye ha anụrị n'ogologo ndụ,
Ndị ntorọbịa anyị meere ha ebere.
VERSE 5
N'amba si ọnwụ g'anyi O Jesu nọnyer' anyị,
Ka ndị mmụọ ozi nke igwe zute anyị,
Ekwekwa la k'anyị laa n'iyi.