Full Lyrics
CHORUS
Bịa nara ahụ Kristi
achịcha nke si n'igwe
bịa ṅụọ ọbara Kristi
n'ụdị mmanya nri aṅụrị.
VERSE 1
Ahụ Kristi bụ nri dị nsọ
ahụ Kristi bụ nri ụmụ elu igwe
n'oriri ahụ n'ọbara gị
elu igwe n'ụwa n'emekọrịta
nara Dinwenu Kristi n'oriri nsọ.
VERSE 2
Bịa nara ya nwa nke mmadụ maka ndụ gị
ọ g'enye gị ndụ okpu, nyekwa gị amara ya
Onyenweanyị n'akụ aka n'ọnụ ụzọ obi gị
megheere y'obi gị k'ọ bata biri.
VERSE 3
Ndị ji ezi obi anata gị
n'oriri nsọ ha g'enwe ndụ ebighị ebi
onye natara gị n'etozughị etozu
ọnwụ ebebe k'ọ riteer'onwe ya.