Full Lyrics
[REFRAIN]
Beere sọ ma iriri Ahụ m.
Beere sọ ma iriri Ahụ m,
sọ ma ị ṅụa ọbara m o,
ị nweta ndụ nke m n'ime gị,
ebighị ebi n'enye ọṅụ,
ebighị ebi, ebighị ebi.
[VERSE 1]
A...hm, ị gaadịrị n'ọcha n'ime mmụọ na eziokwu.
Ị gaadịrị n'ọcha n'ime mmụọ na eziokwu,
tupu ị bịa ka mu na gị buru otu nsọvivi nsọ.
[VERSE 2]
Onye ọbụna gaanata m n'etoghị eto,
n'etoghị eto,
matakwa na ya n'eri ọnwụ ebighị ebi.
[VERSE 3]
Abụ m ihe oriri n'ọṅụṅụ nke dị omimi.
Abụ m ihe oriri nke dị omimi,
ihe oriri n'ọṅụṅụ.
Mmadụ agaghị adị ndụ ma ọ bụ na iriri ya.
[VERSE 4]
Ngozi gaadịrị ha bụ ndị niile
mere obi ha ka ọ bụrụ ebe obibi nke m o.
Ngozi gaadịrị ha bụ ndị niile,
gaadịrị ha bụ ndị niile,
mere obi ha ka ọ bụrụ ebe obibi nke m o,
ebe obibi nke m o.