Full Lyrics
CHORUS
Ahụ Kristi, Ahụ Kristi n'ọbara Ya, bata n'ime m.
Ahụ Kristi, O, Ahụ Kristi n'ọbara Ya, medaa obi mo.
VERSE 1
Kristi kwuru sị, "Abụ m achịcha we nye ndụ;
I rie ahụ m, I g'enwe ndụ okpu;
I ṅụọ ọbara m, I g'enwe ndụ ebighebi.
Nwanne m, were, k'i nwo'ke ezi ndụ."
VERSE 2
Chi m, Chi m, ọbụrụ n'I bata n'ime m a ga m ezu'oke, Jesu mo!
Ka m gbannwee dịka Gị, a ga m adị ọcha Chi m o.
Bata, bịa biri n'ime m;
Bata o, biri o, bata o Dinwenu.
Bata, bata, bata Chi m eh!
Bata, bata, bata Chi m eh!