Full Lyrics
INTRO
Bata Dinwenu n'obi m
Maka mkpuruobi m n'achọ gị
Bịa bata Jesu m o, achọto m gị
Dinwenu njem n'igwe
Ka m kwụsị ike n'ime gị
VERSE 1
Gị bụ Onye nchedo nke ndị kwere nụ
Ekwere m Nna
Bata n'ime m
VERSE 2
Gị bụ Onye mgbazi ndị obi ha dara mba
Achọrọ m gị Nna
Bata n'ime m
VERSE 3
Gị bụ ihe nke ndị nọ n'ọchịchịrị
Ka ihe gị Nna
Bata n'ime m
VERSE 4
Mkpuruobi m chọrọ gị Nna, bata n'ime m
Ihe niile m nwere bụ nke gị Nna, bata n'ime m
Nke gị ka m bụ, nke gị ka m chọrọ ịbụ oh, bata n'ime m
Were zi anụ ahụ m mee ihe masịrị gị eh, bata n'ime m
OUTRO
Ahụrụ m gị n'anya Jesu
Bata bata biri n'ime m
Jesu bata bata biri n'ime m