Full Lyrics
[INTRO]
Ị natago Jesu Nwa Chukwu
nke nọ n'ọlta n'ụdị achịcha na mmanya.
[REFRAIN]
Anyị nwere isiọma
anyị nwere isiọma
bụ ndị a kpọrọ n'oriri nke Nwatụrụ Chukwu.
[VERSE 1]
Dinwenu hụrụ'wa n'anya
O zite r'Ọkpara Ya
ka Ọ nwụọ n'obe
maka mụ na gị na onye ọbụla
kwere na Kristi Dinwenu
a gaghịa nwụ ọ gae nwe ndụ ebighebi ya mere
[VERSE 2]
Dinwenu kwuru sị onye
riri Ahụ mụ o
Ọ gae nwe ndụ ebighebi.
[VERSE 3]
Ọ gae bilite
na mbọsị'kpeazụ ya mere
Ked'ịhụnanya
nke karịrị nke a
na Kristi bịara n'ụwa nwụọ n'elu obe
we r'onwe Ya
mee ezi nri n'enye ndụ
sị'anyị rie k'anyị were nwee ndụ ebighebi ya mere
[VERSE 4]
Nyocha kw'onwe gị
ka ị mara m'ị dị kw'ọcha
Nyocha kw'onwe gị
ma ị nọ n'ọkwa njọ
maka onye natara Jesu n'ọkwa njọ
Ọ ga' nwụ ọnw'ihere maka na
[VERSE 5]
Ked'ihe n'egbochi gị
ị nata Ya?
Ked'ihe n'egbochi gị
ị nata Oriri nsọ?
ọ bụ njọ n'ekewa gị
n'ịhụnanya Chineke gị?
Kwupụta ya nwanne m
Ọ ga' gbaghara gị maka na