Full Lyrics
[TENOR SOLO]
Ụmụnna! Eze udo abịala
[SOPRANO]
Amụgoro anyị nwa Chukwu
Ah! Eh! Amụgoro anyị nwa, amụgoro anyị
Otu nwa, amụgoro anyị nwa
Otu nwa nwoke, amụgoro anyị nwa
Amụgoro anyị nwa, otu nwa
Kristi onye nzọpụta
Amụgoro anyị nwa, Kristi onye nzọpụta
Ibu onye isi
Amụgoro anyị nwa, Kristi onye nzọpụta
Lekwanụ ya n'ubu ya
Ibu onye isi, ibu onye isi g'adịkwasị n'ubu ya
A g'akpọ ya onye isi agha
A g'akpọ ya onye ebube
A g'akpọ ya onye ndụmọdụ
Chineke bụ dike, Nna mgbe niile
A g'akpọ ya Okwu emere ahụ o
[TENOR SOLO]
Okwu emere ahụ
[SOPRANO]
Binyere anyị, Okwu emere ahụ o
Binyere anyị, Okwu emere ahụ o
Eh! Okwu nke Nna
Eh! Chukwu anyị n'ahụ a
Eh! Okwu nke Nna
Eh! Dike n'odogwu
Eze ebu n'afọ, Eze udo
Onye nzọpụta!
Amụgoro anyị nwa, otu nwa
Amụgoro anyị nwa, otu nwa nwoke
Amụgoro anyị nwa, amụgoro anyị nwa
Otu nwa, Kristi onye nzọpụta
Amụgoro anyị nwa, Kristi onye nzọpụta
Otito dịrị Chukwu, dịrị Chukwu
N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ
Ndị ihe ha n'asọ Chukwu
Otito dịrị Chukwu, dịrị Chukwu
N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ
Ndị ihe ha n'asọ Chukwu
Amen, amen, amen, amen, amen, amen, amen.