Full Lyrics
REFRAIN
Akụ kacha mma bụ Kristi Dinwenu,
Akụ kacha mma bụ Kristi n'oriri nso.
Onye riria ahụ n'ọbara Kristi n'oriri nso,
Ọgaranya k'ọ bụ, ọgaranya nke mmụọ.
VERSE 1
Onye nwere Kristi na ndụ ya,
Ọ bara ụba n'onweg'ihe nile.
VERSE 2
Ọ bụrụ na Kristi bata n'obi gị,
Ọ g'eme gị ka ị dị mma.
VERSE 3
Ị naata Kristi n'ọkwa njọ,
Ọnwụ ebeebe nwanne m ka ị naatara.
VERSE 4
Ahụ n'ọbara Kristi bụ ih'oriri,
Naenye ndụ ebighebi.
VERSE 5
Rienụ o ahụ n'ọbara Nwa atụrụ,
Nri ndị ije, akụ kacha mma.