Full Lyrics
[CHORUS]
Aja nke eluobe n'aja nke Altar b'otu ihe
maka n'ọ bụ Kristi n'onwe ya
bụ Onyenchuaja bunukwa ihe ji achụ ya
[REFRAIN]
N'eluobe ọ nagba mmee
man'ugbua n'altar dingọzi
site n'igbuko nd'ukochukwu
ọ naghị agbazi mmee
[VERSE 1]
N'oriri ikpeazụ
ka Kristi dobere Eucharistia dị nsọ
na'ya ka ọ nyere iwu a
nke a na ncheta nke m o
[VERSE 2]
Leenụ Onyenweanyi
ka Ọ nọ n'altar Ukochukwu
zie anyị kalenyere n'ezie
ụzọ nzọpụtanyị
[VERSE 3]
K'anyị sonye Kristi
n'aja nke Missa ọ bụ aja
kasi nsọ n'ihi n'ọ bụ ụzọ
anyị g'esi zute Nna n'enigwe
[VERSE 4]
Leenụ Chukwu nwa
ka ọ si gbasa aka ya n'obe
Eh Ọ na si ndi njọ
bịa naranụ ndụ okpu
[4B]
Ih'omimi dị nsọ dielu
dị n'igb'uko nd'ukochukwu
Achịcha na mmanya k'anyị n'erugharị
n'ọ g'ọdịdị nsọ site n'ak'ukochukwu
Onye nọchiri anya Dinwenu anyị
n'ichunyere Chukwu aja dị okpu
nk'a na ghị agbazi mmee
Ọ naghị agbazi mmee
Ọ naghị agbazi mmee