Full Lyrics
CHORUS
Aja, Aja Misa,
Aja, ahunyere Jesu Kristi,
ehunyere Chukwu,
maka ndi di ndu na ndi nwụr'anwụ.
Ụmụ Chukwu ka'nyi were nụ obi anyị niile
sonye n'emume aja a dị nsọ.
VERSE 1
Ọ bụ aja ahụ Jesu Kristi
jiri onwe Ya chụnteluobe,
n'ugwu Calvary
ebe o jiri ọbara Ya n'enweghị atụtụ
sachaa njọ anyị.
VERSE 2
Aja anyị naachụnyere,
sọọsọ Chukwu
i ji gosi na sọ Ya nwe nke ihe niile
wee ekele Ya mak'otito Ya kasị elu.
Anyị naesikwa na Ya anata
grasi a na ngọzi ọzọ ga
site na Jesu Kristi.
VERSE 3
Ọ bụ emume ịhụnanya
Chukwu dị omimi
na Chineke nyere otu Nwa Ya huomuru
ka o buru ihe aja maka mmadụ
kpafuru na njọ
ka mmadụ wee site n'ọnwụ Nwa Ya n'elu obe
nwetakwa ndụ.
VERSE 4
N'ime nwa Onyenweanyị Jesu Kristi
g'emekwara anyị o muo Ya nri ọma
ọ g'enyekwa anyị Ahụ na Ọbara Ya
n'ụdị achịcha na mmanya nri ọma
ihe nyere ndụ nri ọma naenye ndụ
Achịcha dị ndụ si n'igwe
ụmụ Chineke g'eri.