Full Lyrics
REFRAIN
Jesu agụụ gị naagụ nụ m o
Kristi anụ n'akpọ mụ n'ụzọ maka gị
Dinwenụ m bata bi n'obi m o
O Dinwenụ m bata n'obi m o
biri n'obi m o Dinwenụ m
g'enwe ndụ ebi ebi
nwanne m bakwa nara nri n'enye ndụ
nri ọma si n'igwe achịcha n'enye ndụ
Onye natara Kristi n'okwukwe n'asọ n'asọ ọgaranya nke mụọ
VERSE 1
Arụ Kristi bụ ih'oriri n'ezie o
Ọbara ya bụ ih'ọṅụṅụ dị mma
Kristi ji ọgb'achịcha
Jesu m o n'azụ abụọ
wee zụọ pụkụ mmadụ sị ha rie n'akwụghị ụgwọ o
sị mebenụ ya mebenụ ya na ncheta nke m o
ndị otu Kristi
VERSE 2
Bịanụ k'anyị jeenụ rie
bịanụ k'anyị jeenụ rie Kristi m o
O nri n'enye ndụ
nri Kristi nyer'anyị n'efu
O nri ọma si n'igwe wee
bịa kulite bịa nara Dinwenụ m
VERSE 3
Leenụ Jesu m o
leenụ Dinwenụ m leenụ Jesu m o
Onye nwụrụ maka njọ m o ka ọ nọ n'ụdị achịcha na mmanya
sị anyị rie
K'anyị nweta ndụ n'uju
Ọbara dị oké ọnụ ka ọ nyer'anyị n'efu nụrịbanụ gozi
kpọrọ n'oriri nkenwa tụrụ Chukwu nwa daalụ
be Jesu n'ọna Yukaristia daalụ Jesu daalụ