Full Lyrics
REFRAIN
A ga m eje nara Ahụ Kristi
A ga m eje n'Alter wee nara Ahụ Kristi
Ahụ Dinwenu Jesu Kristi n'enye ndụ o
Nri ọma
VERSE 1
Kristi kwuru sị: Abụ m achịcha ndụ
Abụ m achịcha ndụ nke si n'eligwe bịa n'ụwa
Ony'ọbụla riri ya b'achịcha g'adị ndụ ebighebi
Nri ọma Kristi n'akpọ m òkù n'aga m azaa
VERSE 2
Dinwenu kwuru sị: Abụ m ndụ
Abụ m mbilite n'ọnwụ, Abụ m ndụ
Ony'ọbụla kwere na Mu ọsaghị anwụ anwụ
Ọ bụrụ n'ọ nwụr'anwụ, ọ gaadị ndụ ọzọ
Nri ọma Kristi n'akpọ m òkù n'aga m azaa
VERSE 3
Ọ bụrụ na unu erighi ahụ m o
Ọ bụrụ na unu aṅụgh'ọbara m o
Unu ama nwe ndụ n'ime unu
Okwu Jesu, Achịcha n'enye ndụ
Nri ọma Kristi n'akpọ m òkù n'aga m azaa