Full Lyrics
REFRAIN
Jesu Kristi, achịcha naenye ndụ,
Jesu Kristi, achịcha naenye ndụ.
Nye anyị agụụ naagụ Gị n'uju,
Nri ụbọchị, nri ụbọchị nke naenye ndụ ebighebi e.
K'achịcha nke ndụ ebighebi, k'achịcha naenye ndụ ebighebi.
VERSE 1
Ị nyejuru ikpororiri ndị agụụ naagụ afọ;
Ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka I jiri zụọ afọ,
Puku mmadụ ise. O Kristi,
Nna ndị ogbenye.
VERSE 2
Ọ bụghị ị chọ naanị ndụ ee ndụ dị n'achịcha,
Kama ọ bụ ịnata achịcha nke ndụ,
Onye nwere ozi nke ndụ ebighebi.
VERSE 3
Mgbe I hụrụ igwe mmadụ ahụ,
Igwe mmadụ ike gwụrụ, agụụ naagụ ha.
Ndị n'eso ụzọ Gị sị ha ka ha nye ha ihe ka ha rie,
O nye nwa anyị Jesu Kristi.
VERSE 4
Achịcha nke ndụ ebighebi, mee ka anyị let'ụmụnna anyị,
Achịcha nke ndụ ebighebi, mee ka anyị nye ha ihe ka ha rie,
Achịcha nke ndụ ebighebi, mee ka anyị dịka I si akụzi,
Eucharistia.