Full Lyrics
REFRAIN
Jesu Kristi Achịcha n'enye ndụ,
Jesu Kristi Achịcha n'enye ndụ.
Nye anyị agụụ ị nụ'ụju,
k'I n'enye anyị Nri ụbọchị.
I n'ekpughe re anyị Onwe Gị
k'Achịcha nke ndụ ebighị ebi,
k'Achịcha nke ndụ ebighị ebi,
k'Achịcha nke ndụ ebighị ebi.
VERSE 1
I nyeruru ndị agụụ n'agụ agụụ,
I kpor'oriri maka ndị agụụ, nyejuo ha afọ,
nanị ogbe achịcha ise n'azụ abụọ,
ji rizuo puku ise.
Kristi ndị ogbenye.
VERSE 2
Ọ bụghị chọ nanị ndụ dị n'achịcha,
kama ọ bụ nata achịcha nke ndụ.
Onye k'anyị g'eso? Onye a ga n'anyị?
I nwere ozi nke ebighị ebi.
VERSE 3
Igwe mmadụ ike gwụrụ, igwe mmadụ ahụ,
ndị agụụ n'agụụ sị k'e nye ha nri.