Full Lyrics
REFRAIN
Jesu bịa biri n'ime m, a hụrụ m gị n'anya
Were m mee ihe dị gị mma, a bụ m nke gị
Bịa biri n'ime m, ị bụ enyi ọma
Sachaa m Jesu, a bụ m nke gị
VERSE 1
Achịcha dị ndụ
Achịcha si n'igwe bịa
Bịa biri n'ime m
A bụ m nke gị
VERSE 2
Gị bụ binwenu, gị n'enye ndụ, gị n'enye ike
Gbaa m ume, nri ndị n'onije, a bụ m nke gị
VERSE 3
Nri ndị mmụọ ozi
Nri ndị dị asọ
Bịa biri n'ime m
A bụ m nke gị
VERSE 4
Bịa biri n'obi m
Ị bụ enyi ọma
Sọ gị bụ Chineke m
A bụ m nke gị