Full Lyrics
[CHORUS]
Abụ m achịcha dị ndụ, Dinwenu n'ekwu,
Abụ m achịcha dị ndụ.
Nri si n'eligwe bịa,
Abụ m achịcha dị ndụ,
Nri n'enye ndụ n'ezie,
Abụ m achịcha dị ndụ si n'eligwe bịa,
Onye riri ahụ m o,
Onye riri ahụ m o, ahụ m o,
Onye riri ahụ m o g'adị ndụ n'ezie,
Onye riri ahụ m o,
Onye riri ahụ m o, ahụ m o,
Onye riri ahụ m o g'adị ndụ okpu.
[VERSE 1]
Kristi ekwugo ya wee sị,
ahụ n'ọbara Nwa nke mmadụ, ñụwa ọbara Ya.
Beere sọ m'iriri ya, nwannem,
m'irir'ahụ m o,
Beere sọ m'iriri ya, cheta,
m'irir'ahụ m o,
Beere sọ m'iñụr'ọbara m,
ọbara dị oke ọnụ,
gaghị enwe ndụ n'ime gị.
[VERSE 2]
Abụ m achịcha dị ndụ n'enye ndụ ebighị ebi,
Abụ m achịcha dị ndụ Nna nyer'anyị,
Bịanụ naranụ Kristi, Onye nwụrụ makh'anyị,
Bịanụ naranụ Kristi, Onye zọpụtar'anyị.
[CODA]
Abụ m achịcha dị ndụ,
Ndị otu Kristi, abụ m achịcha dị ndụ.
Kristi ekwugo, abụ m achịcha dị ndụ.
Naranụ m rie, abụ m achịcha dị ndụ.
Naranụ m ñụa, abụ m achịcha dị ndụ.
Nri n'enye ndụ, abụ m achịcha dị ndụ.
Nri si n'igwe, abụ m achịcha dị ndụ.
Achịcha mara nma, abụ m achịcha dị ndụ.
Achịcha dị nsọ, abụ m achịcha dị ndụ.
Rie nweta ndụ ebighị ebi.