Full Lyrics
REFRAIN
Ngwanụ k'anyị jeenụ na Bethlehem
K'anyị jee n'ụlọ anụ
Ebe a mụrụ nwa ka nwa
K'anyị jee n'agbụ ke
Ebe e nibere ya
K'anyị jee hụ Maria na Josef bụ di ya
K'anyị jeenụ jee lelee nw'ọhụrụ a mụrụ anyị
Emmanuel nwaọma
Emmanuel onye nzọpụta anyị nnọọ mọọ
Eze ndieze nnọọ
Kristi nwa Chineke nnọọ.
VERSE 1
Lee kpakpando ya k'ọ pụtara n'igwe
Kpakpando mara mma che lee ya k'ọ namuke
Ndị amamihe hụrụ ya wee soro ya wee jebe o wee
Duru ha wee duru ha n'ụlọ ahụ na Bethlehem.
VERSE 2
Ka ndị nche atụrụ nọ n'ekpa n'eche atụrụ ha n'ime abalị
Mụọma Chineke biakwutere ha
Ebube Chukwu wee chaba chaba gburugburu ha
Egwu jidere ha mana mụọma gwara ha sị unu a
Tụl'egwu e wetara m unu ozi aṅụrị.
VERSE 3
N'ụbọchị taata n'obodo Devid ka a mụrụ Kristi
Dinwenụ onye nzọpụta n'ụwa
Lee unu g'ahụ ka a fụchiri ya n'akwa
Ka e nibere ya n'ụlọ anụ n'agbụke.
VERSE 4
Na mberede igwe ndị mụọma jupụtara
N'eto Chineke naekwe ukw'otito naasị
Otito dịrị Chineke n'elu kachasị elu
Udo dịrị ndị mmadụ n'ụwa ndị nw'obi ọma.