NGWANU K'ANYI JEENU NA BETHLEHEM by Emma Orji — Lyrics

Emma Orji Igbo Christmas Entrance songs Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ngwanụ k'anyị jeenụ na Bethlehem K'anyị jee n'ụlọ anụ Ebe a mụrụ nwa ka nwa K'anyị jee n'agbụ ke Ebe e nibere ya K'anyị jee hụ Maria na Josef bụ di ya K'anyị jeenụ jee lelee nw'ọhụrụ a mụrụ anyị Emmanuel nwaọma Emmanuel onye nzọpụta anyị nnọọ mọọ Eze ndieze nnọọ Kristi nwa Chineke nnọọ. VERSE 1 Lee kpakpando ya k'ọ pụtara n'igwe Kpakpando mara mma che lee ya k'ọ namuke Ndị amamihe hụrụ ya wee soro ya wee jebe o wee Duru ha wee duru ha n'ụlọ ahụ na Bethlehem. VERSE 2 Ka ndị nche atụrụ nọ n'ekpa n'eche atụrụ ha n'ime abalị Mụọma Chineke biakwutere ha Ebube Chukwu wee chaba chaba gburugburu ha Egwu jidere ha mana mụọma gwara ha sị unu a Tụl'egwu e wetara m unu ozi aṅụrị. VERSE 3 N'ụbọchị taata n'obodo Devid ka a mụrụ Kristi Dinwenụ onye nzọpụta n'ụwa Lee unu g'ahụ ka a fụchiri ya n'akwa Ka e nibere ya n'ụlọ anụ n'agbụke. VERSE 4 Na mberede igwe ndị mụọma jupụtara N'eto Chineke naekwe ukw'otito naasị Otito dịrị Chineke n'elu kachasị elu Udo dịrị ndị mmadụ n'ụwa ndị nw'obi ọma.

Download the sheet music

NGWANU K'ANYI JEENU NA BETHLEHEM

NGWANU K'ANYI JEENU NA BETHLEHEM

By Emma Orji
Solfa
Igbo
3 pages
4 Downloads
Christmas Entrance songs Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want