Full Lyrics
INTRO
Good people, good people
St Peters good people
Ai ye, ai ye, ai ye, ai ye
Kwenu, ai ye, ai ye, ai ye
Ọha n'eze bịara n'ebe a
Ndị nze na ọzọ, ndị ukwu na ndị nta
Anyị n'ekele, nnọọ
You are highly welcome na St Peters parish
Nice onye chuwa ya zere
Ndị Rev sis, ndị parish council
Ndị zone niile, able catechist
Parishioners, anyị n'ekele
DANCING TIME
Chineke n'eso ụkọchukwu anyị
Rev father Celestine Anioto
Ọchịagha, ọchịagha n'ime Jesus
Ị bụ ụkọchukwu ebebe n'usoro nke Melkisedek
Anyị kọba kọba kọba kọba, anyị g'akọ ole
Anyị gụba gụba gụba gụba, anyị g'agụ ole
Were anya gị kiribe kiribe
Lee anya okirikiri, ị gaahụ na St Peters agbawego
Uh, St Peters agbawego
Ọchịagha, nara ekele anyị o dike
Afụ dimkpa a, fụ ogologo imi ya
Ị dị k'a chọrọ, father ochiwar
Ngwanụ k'anyị soro ya geribe tobe Chineke
Na twenty five years anniversary
Ị bụ ụkọchukwu
Ahe, ahe, egwu ọgaranya
Tiri tiri tiri tiri tiri tiri
Egwu ọgaranya, obodo ederewo
Father Celestine kulitenụ
Pụtabanụ n'ọgbọ gbaa bal
Onye hụrụ ugo jaa ya mma
A dị chukwu ugo daa, k'anyị tuo ya aha
Ọchịagha, ọchịagha, ochiwar
Ndị isi oche kulitenụ k'anyị jee
K'anyị jeetuo ya aha
Ndị zone niile kulite
Societies niile kulite
K'anyị jeetuo ya aha
Mmadụ niile kulite
K'anyị jeetuo ya aha
Ọchịagha, ochiwar
Ekele dịrị ụnụ niile
Chukwu chebe ụnụ niile, Amen, Amen.