Full Lyrics
INTRO
Umunne n'ụmụnnam o,
Taata bụ Chukwu mere ya,
Ụbọchị onyenwe anyị,
Ụbọchị ọma k'anyị gorie.
CHORUS
Tibenu mkpu ọṅụrị,
Gbabanu egwu aṅụrị e,
Ndị otu Kristi,
Taata bụ Chukwu mere ya,
Ụbọchị ọma nke Chukwu nyer'anyị,
K'anyị ṅụrịa ṅụrịa gorie na ya.
VERSE 2
Olisebul'ụwa Chukwu nna,
Dike na dimkpa,
Agbakwur'ezur'ike,
Onye n'eme mma,
Nar'ekele anyị jiri bịa maka ekele,
Ndụ n'ahụ isike,
Ụbọchị ọma nna,
Ị hụr'anyị n'anya,
Imela imela imela imela,
Ekele n'otito.
VERSE 3
Anyị bịar'ikpo isiala nye Chukwu k'er'ụwa n'eluigwe,
Chụọrọ ya aja Misa,
Rịọkwa ya mgbaghara,
Nat'ebere n'aka ya kelee ya,
Maka ọgọ n'afọma ya,
Makana ekele dike na nk'o mere o me kw'ọzọ.