Full Lyrics
REFRAIN
Sọ otu ihe ka m naarịọ n'aka Dinwenu
ka m biri, ka m biri
n'ụlọ nke Dinwenu na mbọsị ndụ m niile.
VERSE 1
Dinwenu bụ ike m na nzọpụta m,
Onye ka m gaatụ egwu?
Dinwenu bụ ebe mgbaba m,
Onye gaeyi m egwu?
VERSE 2
Ọ gaezobe m n'ebe obibi Ya
na mbọsị ọgbaaghara,
Ọ gaezobe m n'ime mkpụkpụ Ya,
Kwụbasie m ike na nkume bụ Dinwenu.
VERSE 3
A ga m ewere obi añụrị
naachụ aja n'ụlọ Dinwenu,
a ga m ekwu okwu añụrị nye Dinwenu.
VERSE 4
Otito dịrị Nna na Nwa,
na Mmụọ Nsọ n'ụwa tọwa niile.