SỌ GỊNWE ISIALA by Emma Orji — Lyrics

Emma Orji Igbo Offertory Hymns Hymns Prayer Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Oge erugo mgbe anyị ji efe Chukwu. O rugo mgbe anyị ji eto ya. O rugo mgbe anyị ji ebuli Chineke elu, bunye ya otito nile, kelee ya mak'ọgọ ya, rịọ ya mgbaghara na ngozi ya. Ọchukwu lee anyị o, ezi Nna anyị abịala isiala. REFRAIN Sọsọ Gị nwe ya ikpere ala, nanị Gị nwe ya ojija mma. Sọsọ Gị nwe ya, sọ Gị o Chineke isiala. VERSE 1 M rahụ ụra wee bilie n'ụtụtụ, ngozi Chineke ka ọ bụ. M'akpọ isiala kelee Chineke n'ihi ndụ rụm Gị isiala. VERSE 2 M je ije m lọta, ọ kwa ngozi Chineke ka ọ bụ. Agam egbu ikpere kele Chimo, n'ọbụ Chi naedu ije isiala. VERSE 3 N'ime ezi n'ụlọ m o, aka Chukwu dị ya. Abịaram ibuli Chi n'elu maka mmeso ọma ya isiala. VERSE 4 Maka mgbaghara njọ nke ị naagbaghara m o, abịaram ịja Gị mma n'ihi n'ihụrum n'anya isiala. VERSE 5 Merem gaba n'ihu ezi Chineke m o, agam naakpọrọ Gị isiala m o, n'ihi na sọ Gị nwe ya isiala.

Download the sheet music

SỌ GỊNWE ISIALA

SỌ GỊNWE ISIALA

By Emma Orji
Solfa
Igbo
2 pages
2 Downloads
Offertory Hymns Hymns Prayer
0 0

More lyrics you may want