Full Lyrics
REFRAIN
O Chukwu nk'igwe, zanụ mo, Nna.
Onye nwem, wer'ọsọ zanụ o!
M chebe ndị ụwa na mmiri erie mo!
VERSE 1
Sọ Ngị, Nna, bụ Chi kere mmadụ.
O Chukwu Nna, Onye ker'ihe nile.
Doo Nna, zanụ mo!
VERSE 2
O Chukwu, biko lee anyị anya n'obi.
O Chukwu biko, bik'elel'anya na njọ.
Ị gbakọwa nmehie, mmiri erie anyị o.
VERSE 3
Njọ m nile, ndị kpar'anyị oke.
O Chukwu biko, biko kpọchapụ.
Ka m mee ezi ebere nke si n'ime nmụọm.
VERSE 4
Sọ Ngị Nna bụ Alpha n'Omega.
O Chukwu nk'igwe Onye nwe ndụ mo.
Ekwela ndị ụwa kpagbue mo!
VERSE 5
Si n'im'eligwe chụb'ajọ mmadụ,
Si n'im'eligwe chụb'ajọ nmụọ.
Ekwela ndị ụwa kpagbue mo!