NURU EKPERE ANYI by Stanley Anih — Lyrics

Stanley Anih Igbo Prayer of the Faithful (POF) Prayer Solfa notation

Full Lyrics

TENOR SOLO Chukwu anyị abịawo e, anyị abịawo kwa e. CHORUS Olisa bi n'igwe, ọ kwa gị bụ ike anyị o. Olisa bi n'igwe, ọ kwa gị bụ mgbapụta anyị o. Olisa doh biko, Olisa doh biko. BASS SOLO Olisa bi n'a e, nụrụ nụrụ e ekpere anyị o. CHORUS Doh biko nụrụ ekpere anyị o. Olisa doh biko nụrụ ekpere anyị o. Olisa bi n'igwe biko nụrụ ayịyọ anyị o. Ana nụrụ nụ anyị o, e nu nụrụ nụ anyị o. Ewo ya dịkwara nwa kem ma dịkwara nwa gị nma. Olisa doh, Olisa doh egbe belu ugo belu e k'anyị nayọ Olisa. Doh biko nụrụ ekpere anyị o. Olisa doh biko nụrụ ayịyọ anyị o. Olisa doh biko, Olisa doh biko. Nụrụ akwa anyị o, akwa. Nụrụ akwa anyị o, akwa. Ogonogo ndụ, ogonogo ndụ n'ahụ isike ka anyị na yọ. Anyị na yọ, anyị na yọ, anyị na yọ, anyị na yọ, anyị na yọ. Makana ndụ bụ isi, ndụ bụ isi na ndụ bụ isi e. Chukwu e Onye nwe anyị e nụrụ ekpere anyị o. SOPRANO CANTORS Cheta kwa oh Chukwu n'anyị a. CHORUS Biko nụrụ ayịyọ anyị o. Olisa biko nụrụ ekpere anyị o. Anyị na yọ, anyị na yọ, anyị na yọ, anyị na yọ, anyị na yọ, anyị na yọ. BASS SOLO Dịgị ike anyị eweghịrị onwe anyị, mana gị oh Chukwu bụ ike anyị o, biko biazịe zanụ anyị o, anyị na yọ. CHORUS Biko nụrụ akwa anyị o. Biko zanụ anyị o. Anyị na yọ, Olisa biko zanụ anyị o. Gị Olisa bi n'igwe nye nụ anyị udo. Makana udo na ịdị n'otu na enweta ga n'iru. Olisa bikozie, Olisa doh nụrụ ekpere anyị o. Ihe ọma e, ihe dimma e rutu nụ anyị aka. Ihe ọma e, ihe dimma e rutu nụ anyị aka. Olisa doh nụrụ ekpere anyị o. Olisa doh nụrụ ekpere anyị o. Bikozie ma gozie anyị o. Ma gozie anyị o. Biko gozie anyị o. Gozie gozie doh. Ise, ise.

Download the sheet music

NURU EKPERE ANYI

NURU EKPERE ANYI

By Stanley Anih
Solfa
Igbo
4 pages
19 Downloads
Prayer of the Faithful (POF) Prayer
0 1

More lyrics you may want