Full Lyrics
[CHORUS]
Ebube kere igwe n'ụwa, ọṅụ m ekele gị Chim ọma.
Ọmọkachie bịa nara ekele.
Chi ka nze n'ọzọ, onye naemere m ihe mara mma, aka m dị n'elu Chineke.
Bịa nara ekele.
[REFRAIN 1]
Oyooyo Chim ọma,
Oyooyo Chim ọma,
Oyooyo Chim ọma,
Onye naeburu m agha zoro ezo.
Oyooyo Chimo eh!
Chim ọma dị mma, aka m dị n'elu, bịa nara ekele.
[VERSE 1]
Isiyi nke ndụ m o, Chukwu ọma dị mma.
Oji ji jide mma, ọṅụ m ekele gị ị meela.
Ndụ inyere m o atọgbuo go m o, ezi Chim ọma dị mma, aka m dị n'elu.
Oyooyo Chim ọma.
[VERSE 2]
Onye naagwọ m ọrịa n'anaghị ego, Chi ka dibịa.
Ọgwọ ọrịa m o, ọṅụ m ekele gị ị meela.
Maka ọrịa ahụ gwọrọ m o, mgbe m naenweghị olileanya.
Aka m dị n'elu, Oyooyo Chim ọma.
[VERSE 3]
Dike ndị kerere, Agụ naeche mba.
Ugwu a naarịa atụ egwu, daalụ o! Ị meela.
Ihe niile ị naemere m o, ha niile dị m mma n'obi, aka m dị n'elu.
Oyooyo Chim ọma.
[REFRAIN 2]
Aka m, aka m, aka m dị n'elu.
Chi ka nze n'ọzọ ekele o, ka m jiri bịa zie Chim ọma.