Full Lyrics
[SECTION APlaintively]
Ewo Christi talu afụfụ
O talu afụfụ maka njọ anyị!
Oh eh maka njọ anyị
[NARRATOR]
Gbapụta ụnụ nile ma na ha mara ya ikpe ọwụ ha wee tie!
[CHIEF PRIEST]
Paileti kpọgbue ya eh
[NARRATOR]
Ha wee sie!
[TENOR / BASS]
Ọ n'eme ihe ọjọọ
Ọ n'emebi iwu obodo
O mere onwe ya Ọkpara Chineke
[CHORUSFurioso]
Ọ bụa sị e kpọgbue ya
E kpọgbue ya, e kpọgbue ya
Biko tụgharịa ngwa ngwa
Ọ sị na ya bụ Mesaia na ya bụ eze
E kpọgbue ya e, e kpọgbue ya e
[NARRATOR]
Paileti sị ha wee sị aka m a dighị ya
[CHIEF PRIEST]
Ọ bụrụ godu n'ọnwụ o, ka ọbara ya dị anyị n'isi
Ọ bụrụ godu n'ọnwụ o, ọbara ya dị anyị n'isi
E kpọgbue ya
[CHORUS]
E kpọgbue ya e, kpọgbue ya e
[SECTION BPlaintively]
Christi talu afụfụ ma nwụọ
Ma nwụọ e
[NARRATOR]
O biliterie n'ọnwụ
[CHORUSVivace]
Ma o bilitere n'ọnwụ e n'ọnwụ
O merigo ike ọnwụ
Ike nile dị zi ya n'aka
Makana Ọ bụ dike ngwa
Tibe nụ mkpu ọṅụ na Chukwu nwa ebiliwo k'o si kwu
[CHORUSJoyfully]
Alleluia, Christi ebiliwo n'ọnwụ
Mmeri mmeri bụ zinke ya e
Alleluia, Christi ebiliwo n'ọnwụ
[CANTORS]
Onye meri! Onye mmeri! Dike!
[CHORUS]
Mmeri mmeri bụ zinke ya e
Alleluia, Christi ebiliwo n'ọnwụ
Christi e merigo, alleluia
Onye mmeri, Onye mmeri
Christi Onye mmeri
Christi Odogwu! Ike ka ike!
Onye mmeri e... Onye mmeri.