OTITO DIRI CHINEKE by Fr. Bart C. Ezeokafor — Lyrics

Fr. Bart C. Ezeokafor Igbo Mass Settings Gloria Penitential Rite / Kyrie Solfa notation

Full Lyrics

[INTRO] Otito dịrị Chineke n'elu kach'elu; N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ ndị nwere obi ọma, ndị mmadụ ndị nwere obi ọma. [REFRAIN] Otito dịrị Chukwu Otito dịrị Chukwu N'elu n'elu kasi elu [VERSE 1] Anyị ajaa Gị mma Anyị agọzie Gị Anyị ekpuoro Gị Anyị etoo Gị Anyị ekelee Gị n'ihi nnukwu ebube Gị Oseburụwa Chukwu Eze nke eluigwe Chukwu Nna ji ike nile. Otito dịrị Gị n'elu kasi elu. [VERSE 2] Dinwenu Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ Dinwenu Chukwu Nwa atụrụ nke Chineke Nwa nke Nna Gị Onye naekpochapụ njọ nk'ụwa meer'anyị ebere Gị Onye naekpochapụ njọ nk'ụwa nụr'arịrịọ anyị Gị Onye nọ n'aka nri Nna meer'anyị ebere Otito dịrị Gị n'elu kasi elu. [VERSE 3] N'ihi na sọ Gị dị Nsọ, sọ Gị bụ Dinwenu, sọ Gị Jesu Kristi, kachasị dị elu Gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna Amen, Amen! Otito dịrị Gị n'elu kasi elu. [ONYENWEANYI MEE EBERE] Oh Onyenweanyị meer'anyị ebere O Onyenweanyị Oh Onyenweanyị biko meer'anyị ebere biko meere anyị ebere meere anyị ebere Kristi meere anyị ebere mee ebere Oh Kristi biko biko meere anyị ebere meere anyị ebere

Download the sheet music

OTITO DIRI CHINEKE

OTITO DIRI CHINEKE

By Fr. Bart C. Ezeokafor
Solfa
Igbo
2 pages
3 Downloads
Mass Settings Gloria Penitential Rite / Kyrie
0 0

More lyrics you may want