Full Lyrics
[INTRO]
Otito dịrị Chineke n'elu kach'elu;
N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ ndị nwere obi ọma,
ndị mmadụ ndị nwere obi ọma.
[REFRAIN]
Otito dịrị Chukwu
Otito dịrị Chukwu
N'elu n'elu kasi elu
[VERSE 1]
Anyị ajaa Gị mma
Anyị agọzie Gị
Anyị ekpuoro Gị
Anyị etoo Gị
Anyị ekelee Gị n'ihi nnukwu ebube Gị
Oseburụwa Chukwu
Eze nke eluigwe
Chukwu Nna ji ike nile.
Otito dịrị Gị n'elu kasi elu.
[VERSE 2]
Dinwenu Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ
Dinwenu Chukwu Nwa atụrụ nke Chineke
Nwa nke Nna Gị Onye naekpochapụ njọ nk'ụwa meer'anyị ebere
Gị Onye naekpochapụ njọ nk'ụwa nụr'arịrịọ anyị
Gị Onye nọ n'aka nri Nna meer'anyị ebere
Otito dịrị Gị n'elu kasi elu.
[VERSE 3]
N'ihi na sọ Gị dị Nsọ, sọ Gị bụ Dinwenu,
sọ Gị Jesu Kristi, kachasị dị elu
Gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna Amen, Amen!
Otito dịrị Gị n'elu kasi elu.
[ONYENWEANYI MEE EBERE]
Oh Onyenweanyị meer'anyị ebere
O Onyenweanyị
Oh Onyenweanyị biko meer'anyị ebere
biko meere anyị ebere
meere anyị ebere
Kristi meere anyị ebere
mee ebere
Oh Kristi biko
biko meere anyị ebere
meere anyị ebere