Full Lyrics
OTITO DIRI CHINEKE
CHORUS
Otito diri Chineke n'elu kach'elu,
N'uwa udo udo diri ndi mmadu ndi nwere obi ọma,
ndi mmadu ndi nwere obi ọma.
VERSE 1
Anyi ajaa Gị mma eh
Anyi agozie Gị eh
Anyi esekpuoro Gị
Anyi etoo Gị
Anyi ekelee Gị n'ihi nnukwu ebube Gị
Oseburuwa Chukwu
Eze nke eluigwe Chukwu Nna ike nile.
Otito diri Gị n'elu kasi elu.
VERSE 2
Dinwenu Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ
Dinwenu Chukwu nwaturu nke Chineke Nwa nke Nna
naekpochapu njọ nk'uwa meer'anyi ebere
Gị Onye naekpochapu njọ nk'uwa nur'aririo anyi
Gị Onye nọn'aka nri Nna meer'anyi ebere
Otito diri Gị n'elu kasi elu.
VERSE 3
N'ihi na sọ Gị di Nsọ, sọ Gị bu Dinwenu, sọ Gị kachasi di elu
Jesu Kristi,
sọ n'ebube Chukwu Nna Amen, Amen!
Otito diri Gị n'elu kasi elu.
ONYENWEANYI MEE EBERE
Oh Onyenweanyi mee r'anyi ebere
O Onyenweanyi mee r'anyi ebere
O Kristi mee r'anyi ebere
Oh Kristi mee r'anyi ebere
O Onyenweanyi mee r'anyi ebere
Oh Onyenweanyi mee r'anyi ebere