Full Lyrics
CHORUS
Onyinye di mma,
K'anyi n'enye Gi Nna,
Nar'onyinye,
Ezi Chineke Nna, nar'onyinye.
Nar'onyiny'anyi, Nna,
Gozi'anyi umu Gi.
Nara ya, nara ya gozie.
Nar'onyiny'anyi, nara ya, nara ya gozie.
VERSE 1
Chineke nyer'anyi onyinye d'ich'iche:
Okwesiri k'anyi bunyere Chineke onyinye di mma.
Nye Chineke onyinye O gaenye gi mma.
K'anyi wer'ihe Chukwu nyer'anyi jaa Ya mma.
VERSE 2
Chukwuma kere gi were akon'uche:
Bia kelee Ya O gaenye gi mma ji,
Buru mma bia Ya abụ otito n'ih'omere gi.
Ezinwannem bia nye Ya ekele di mma.