Full Lyrics
CHORUS
Onyinye, onyinye o
Ka m g'ebunye Chineke
K'ọ nara, k'ọ gozie.
VERSE 1
Wer' ihe dị mma nye Chukwu,
Bur' egwu dị mma bugara Chukwu
Kele Chineke dị ebube
Ọ dị ukwu, ọ mara mma.
VERSE 2
Onye n'enye ndụ bụ Chukwu,
Onye n'enye akụ Chukwu ọma
Onye ker' igwe kee ụwa
Nara onyiny' anyị k'ị gozie.
VERSE 3
Ọ n'agwọ m ọrịa anaghị ego
Duga m njem dulata
Buru godu n'onweghị ihe m nwere
Ka m nye ya onwe m k'ọ gozie.
VERSE 4
Ngị onye dị ndụ kulite
K'anyị wer' ọṅụ kele Chukwu
Wer' ihe dị mma bur' ibu
Kele nụ Chi anyị Onye ọma.