Full Lyrics
CHORUS
Onyinye, Onyinye O
Kam g'ebunye Chineke
K'Ogozie.
VERSE 1
Wer'ihe di mma nye Chukwu,
Buru ngwa di mma bugoro Chukwu
Kele Chineke di ebube
O di ukwu O mara mma.
VERSE 2
Onye n'enye ndu bu Chukwu,
Onye n'enye aku Chukwu oma
Onye ker'uwa kee madu
Nar'onyiny'anyi k'I gozie.
VERSE 3
N'ihi n'obud' anyi k'eje
Duga m njem dulata
Eze igwe
Nar'onyiny'anyi k'I gozie.
VERSE 4
Wer'ihe di mma kulite
K'anyi wer'onu kele Chukwu
Wer'ihe di mma kelenu
Ch'anyi Onye oma.