OME IHE by S.O. Emma Agu — Lyrics

S.O. Emma Agu Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Yahweh emel' ihe ahụ juru m anya. O mere ya ogem naatụghị anya ya. Mgbogbajuru doro n'ime m dum o mere ihe juru m anya, ihe juru m ọnụkọ. Mekwala k'osieme o tinye l'ọchị n'ọnụ m taa. O tinye l'ọñụ n'obi m o. Ihe m rịọrọ ya k'o mere m tinye jara o. Metala m mma eh, otito ya gaadị m n'ọnụ oge niile n'ebe niile. Ome ihe rịb' otito m n'osi n'alaala obi m pụta. [VERSE 1] I meela, I meela Chukwu n'ime m dum o. I meela, I meela Yahweh. Ị dị mma, ị dị mma ee! n'asọ m ụtọ. I meela, I meela Yahweh. Ị dị mma, ị dị mma. Obi m naañụrị n'ịdị mma gị. Chukwu ị dị mma, ị dị mma, ị dị mma Chukwu. [VERSE 2] Kedu ihe m gaemere Chineke? Ọ bụ akụnụba? K'ọ bụ ego? Ọ bụ ụlọ? K'ọ bụ ụgbọ njem n'ezie? Amam n'ihe ụtọ nke ụwa adịghị amasị gị. Kedu nnọọ, kedu nnọọ ihe m gaemere Chineke? [VERSE 3] Kedu, kedu, kedu ihe m gaemere gị? Amam n'ihe ụtọ nke ụwa adịghị amasị gị. Nani otito. Ndị nsọ naebunye gị, otito! Ndị mmụọ ozi naebunye gị, otito! Nzukọ naebunye gị, otito! Ndị echichi naebunye gị, otito! Ndị ụka naebunye gị, otito! Ụmụ mmadụ naebunye gị, otito! Ezinụlọ naebunye gị, otito! Mụ onwe m naebunye gị, otito n'ị dị mma.

Download the sheet music

OME IHE

OME IHE

By S.O. Emma Agu
Solfa
Igbo
4 pages
0 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want