Oluoma Chukwu by Alvin C. Okpogba — Lyrics

Alvin C. Okpogba Igbo Celebrations Hymns Offertory Hymns Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Oluoma chukwu ebuka Chukwu na ro bi m o Obi m naaṅụ rịo n'ime chukwu Ihe Chukwu meere m kọba ya chi gaeji Ewo chukwu bole Oluoma chukwu mu Chineke Lee chukwu agọzigo m REFRAIN Ndị nwe m unu ma na chukwu agọzigo m o Orobodo lee chukwu agọzigo m o Ezi n'ụlọ m e chukwu agọzigo m Ekele dị n'Olisa chukwu agọzigo m o Maka n'abụ m oluoma chukwu VERSE 1 Mgbe a dị m ime m o... N'afọ nne m Chukwu ekwugi ihe m gaabụ! Ya k'O jiri pịchasịa ka ya were kpụọ m tinye m n'afọ Nne m ọmalịcha chukwu Mgbe m ka bụ nwa Chukwu agọzigo ndụ m o Were n'echekwaba m n'ihe ọjọọ niile N'ihe naemerụ ahụ Chukwu ke n'ụwa Ekele o o Aka m dị n'elu o Ekele otito N'ihi n'o ruru gị VERSE 2 Ụfọdụ mmadụ ibe m ekwero na chukwu dị ike Ha ji achọ itenriba m n'ebe dị iche iche Wee tinye onwe ha n'ansogbu Ma n'ekwere m o n'ọdịghị ihe nyịrị chukwu mu me! Ya ka chukwu ji họrọ m n'egboro m mkpa Ọ dighi ihe kọrọ m n'ali Afọma chukwu ebuka Chukwu bariba ngozi chukwu bariba Nwanne m a chọba m y'eji amatu oluoma chukwu Ọ bụ m k'agaakpọ! VERSE 3 Onye ka m bụ nụ o? Oluoma chukwu a bụ m o oluoma chukwu Chukwu ji amaatu leke n'elu ụwa niile Ị ma n'ihe niile dị n'ime ya bụ... Leke n'anya ndụ m o Leke n'anya ndụ gị o Oluoma chukwu a bụ m o oluoma chukwu Lekene ka chineke m ha... A gidigba gidigba! Ka anyị tụọ n'obi igwe... Ka anyị jee n'ụlọ ya jaa ya... Mma mma mma mma Ezi chukwu bụ chukwu Maka n'a bụkwa m onya ka gị o

Download the sheet music

Oluoma Chukwu

Oluoma Chukwu

By Alvin C. Okpogba
Solfa
Igbo
4 pages
1 Downloads
Celebrations Hymns Offertory Hymns
0 0

More lyrics you may want