Full Lyrics
[INTRO]
K'anyi kelee, kelee
[REFRAIN]
Olisa, k'anyi jee jaa Ya mma
Olisa nk'igwe! Chineke mo!
Ọ bụ Ya n'elekọta mo!
Ọ bụ Ya n'echekwaba mo!
Olisa e gboo! Nnamma, biko nar'ekemeka!
Olisebuluwa doo, nar'ekele.
Olisa imelaa! Ihe dị ebube k'I n'eme!
Ma ihu m'azụ m, ihe dị ebube ojuru m'anya!
Aka m dị n'elu! Oruolu Gị. Ekele dịrị Gị! Odịrị Gị! Oziere Gị. Igwe n'eche ndụ mo!
Aka m dị n'elu! Oruolu Gị. Ekele dịrị Gị! Odịrị Gị! Oziere Gị. Chi n'eme nma!
[VERSE 1]
Udara dara n'ala.
Azụ bi na mmiri emetugo aja.
Anyị bi n'ụwa ndigh'agọ agụgọ mmiri
Onye njọ kam bụ, man'Olisa ejo zur'anyị ahụ!
Ọnwụr'ọ nwụ n'obe, ọnwụ legh'anya na njọ mo.
Na k'ojiri zọọ mo.
K'anyi kelee, kelee
[VERSE 2]
Chukwu kere nwa, gagh'ekwe ka nwa ya taa ahụ!
Chi ma mkpa mo, I n'egboro m mkpa mo!
Onyiny' I nyere mo bar'ụba Nna, ya kam ji eme ọnụ,
Agụ n'eche mba mo, Olisa imeka
K'anyi kelee, kelee
[VERSE 3]
Nwa n'eso okenye, ọtagh'ose ọtaa ọjị,
makana Ak'an'aga n'akụkụ ọkụ, n'agọkwa n'akụkụ ọnụ.
Onye n'eso gị n'azụ Chineke, O nwerihe nile
Olisebuluwa n'azụ mo, Ọdịghịhe kọrọ mo.
Ochendo mo! Agụ bata mgbad'awara ọsọ!
K'anyi kelee, kelee