Full Lyrics
CHORUS
Ogechi oge Chukwu ka mma
Nwa nke Chineke chekwube na Chineke n'oga'za
Ngozi sina'ka Chukwu bia
Onyinye sina'ka Chukwu bia o
Bu onyinye di ebighiebi
Oge ya ka mma.
VERSE 1
Uwa na'kom onu na m'amughi nwa
Chukwu ebere mo akpokurum gi
Iweyumu mara mma gozie mo
Ututu ehihie n'abali
Kam na'tukwasa gi obi
Chere oge Chineke inugo nwannem n'oga'za.
VERSE 2
Mgbe ebuli ego turu m
Agbakwutere m gi Chineke izara mo
Mee ka ebuli ahu dere duu
Ibiara n'oge gi wee were aku choo m mma
Chere oge Chineke inugo nwannem n'oga'za.
VERSE 3
Enweghim ulo Chineke
Mwee besara gi akwa
Mgbe n'adighi anya iwee nyem ebe obibi
Ekele juru m onu n'inyere m ebe obibi kacha mma
Chere oge Chineke inugo nwannem n'oga'za.
VERSE 4
Mgbe odika'ga' si n'olilanya' dighi nwannem chere
Cher'oge Chukwu n'onyinye' kwensu bu ihe' fu
Wet'isi wer'isi bu onyinye kwensu n'enye
Chere oge Chineke inugo nwannem n'oga'za.