Full Lyrics
INTRO
Ọbọrọ chi kele Chi eh! Ya kele Chi ya eh!
Ọbọrọ chi kele Chi ya ewo! El'ụwa dị ogbu.
REFRAIN
Ọbọrọ chi kele Chi eh! Ya kele Chi ya eh!
Ọbọrọ chi kele Chi ya ewo! El'ụwa dị ogbu.
Ị hụlanụ n'ụwa enwegh'isi o!
Ụwa enwegh'ọdụ o!
Ọ bụ sọ Chi na elo, n'aka Ya ka m gara kuo paa!
Onyinye dị nma ka m g'eji bịa n'iru Gị Nna.
Chukwu, ọdịgh'onye dịka Gị!
I yoo! Mmh! Eh! Aaha!
I yoo! Eehe! N'aka Chukwu ka m gara kuo paa!
VERSE 1
Chee echiche nwannem banyer'onwe gị.
Oge Chineke nyere mmadụ n'ụwa n'agwụ agwụ.
Ụwa b'ahịa; ih'onye zụtara ọ buru laa.
El'ụwa b'ahịa, onye zụchaa nke ya ọ laa!
Ụwa b'ahịa; ndị b'anyị n'ụwa b'ahịa nụ o!
El'ụwa b'ahịa; ndị n'eje, ndị n'alaa!
VERSE 2
Ị ma n'ome nma n'emer'onwe ya,
Ome njọ n'emer'onwe ya.
Ih'onye metara n'el'ụwa k'o ji ala nmụọ!
Ụwa abụgh'eb'obibi.
Ony'eji l'ụwa em'ọnụ.
Anyị nile bịara abịa!
Mmadụ nile g'ala!
VERSE 3
Ony'ebul'ụwa n'isi!
Ony'azọn'ụw'azọ!
Onye chụb'ụwa n'ike, ụw'agbanarị ya n'ọsọ!
Ngwere ghar'ọsịsị, ak'akpara ya!
Tụkwasị Chukwu obi na emesịa ọ gadị nma!