Full Lyrics
[REFRAIN]
Ikenna, Ike Ya n'edu mo n'uwa Ike Chukwu,
Ikenna mo. Ike, ike kach'ike! Ikechukwu,
ikem jie je mba lee n'uwa. K'anyi jee, k'anyi jenu
kelee Ya, O meela! Kelee Chineke si Ya daalu. O meela!
[VERSE 1]
Omumu adighi mfe, o bukwa n'ike Nna mo!
Omumu sir'ike, o bukwa n'ike Chukwu o!
Nwanyi tur'ime, muo nwa n'udo,
kelee Chukwu o, o bukwa n'ike Ya!
[VERSE 2]
Ahu is'ike, o bukwa n'ike Nna mo!
Ahu idi nma, o bukwa n'ike Chukwu o!
Ahu igbas'ike, Chineke jiri ya choo gi nma,
kelee Chukwu o, o bukwa n'ike Ya!
[VERSE 3]
I nwere ego? O bukwa n'ike Nna mo!
I nwer'aku n'uba? Ha bukwa n'ike Chukwu o!
Were ha fee Chukwu, nyere mmadu ibe gi aka!
Aku amaka! Ha bukwa n'ike Ya!