IKENNA by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Celebrations Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ikenna, Ike ya n'edu m o n'ụwa Ikechukwu, Ikem ji eje mba lee n'ụwa K'anyị jee, k'anyị je kele ya, O meela! Kelee Chineke sị ya daalụ, O meela! VERSE 1 Ọmụmụ adịghị mfe, Ọ bụkwa n'ike nna m o! Ọmụmụ siri ike, Ọ bụkwa n'ike Chukwu o! Nwanyị tụrụ ime, mụọ nwa n'udo Kelee Chukwu o, Ọ bụkwa n'ike ya! VERSE 2 Ahụ isike, Ọ bụkwa n'ike nna m o! Ahụ ịdị mma, Ọ bụkwa n'ike Chukwu o! Ahụ gbasike, Chineke jiri ya chọọ gị mma; Kelee Chukwu o, Ọ bụkwa n'ike ya! VERSE 3 Ị nwere ego? Ọ bụkwa n'ike nna m o! Ị nwere akụ n'ụba? Ha bụkwa n'ike Chukwu o! Were ha fee Chukwu, nyere mmadụ ibe gị aka Akụ amaka! Ha bụkwa n'ike ya!

Download the sheet music

IKENNA

IKENNA

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
3 pages
17 Downloads
Offertory Hymns Hymns Celebrations
0 0

More lyrics you may want