Full Lyrics
REFRAIN
Ebe Chim nọnyere m o!
Ọ dịghị onye g'emegide m
O meworo m ihe dị ukwu n'ezie
Aga m eji abụ ụtọ too aha Ya
Oyoyo Chim ọma e
O meworo m ihe dị ukwu
VERSE 1
A maara m na Chim n'efe
Agaghị agharapụ m
Maara m na O g'agbatara m ọsọ e
Nye m aka
Oge niile, ụbọchị niile n'ezie
Chukwu nọnyere m o
VERSE 2
O nechebe m o
Ghara ịhụ m anya
Oge niile, ụbọchị niile n'ezie
Chukwu nọnyere m o
VERSE 3
A maara m na Onye m n'eso
Bụ ọdọgwụ akataka
A maara m o na O n'eburu m agha zoro ezo
Oge niile, ụbọchị niile n'ezie
Chukwu nọnyere m o
VERSE 4
N'ezie ekwensu enweghị ike n'ebe m nọ
N'ezie aka Chukwu jigidere m
Oge niile, ụbọchị niile n'ezie
Chukwu nọnyere m o