NARA ONYINYE ANYI N'OBI OCHA by Jude Nwankwo — Lyrics

Jude Nwankwo Igbo Offertory Hymns Hymns Consecration Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Chukwu Nna, Nna, Anyị abịa l'inye gị ekele, Chukwu Nna, Nna, Nara onyinye anyị n'obi ọcha. Tucha mmehie niile anyị mere, Nara ya biko Chineke ma gozie ya n'obi ebere. VERSE 1 Ezi Chineke nara onyinye ụmụ gị n'enye gị, Nna o, Abel nwa odibo gị, na aja nke ukochukwu gị Melkisedek. VERSE 2 Cheta na mmiri ozuzo bụ onyinye Chineke nyer' anyị n'efu, Ọnwa na anyanwụ, ha ncha bụ ọrụ aka Chukwu, Ikuku n'enye anyị ndụ bụ onyinye Chukwu, gịnị gaegbochi Gị inye ya ekele dị mma. VERSE 3 Oge erugo ụmụ Chineke, ngwanụ kunitenụ k'anyị ga nye ya ekele. Maka ihe ọma dị iche Chineke meere anyị, ngwanụ kunitenụ k'anyị ga nye ya ekele. Lee onwe gị anya ka ị hụ ọrụ ebube Chineke, ngwanụ kulitenụ nye ya ekele. Mgbe ị nọ n'ọrịa ọ bụ ya zọrọ gị, nye gị ahụ ike, ngwanụ kunitenụ k'anyị ga nye ya ekele. Mgbe ị n'aga njem ọ bụ ya n'edu gị, ngwanụ kulitenụ nye ya ekele. Oge erugo ụmụ Chineke, ngwanụ kulitenụ nye ya ekele.

Download the sheet music

NARA ONYINYE ANYI N'OBI OCHA

NARA ONYINYE ANYI N'OBI OCHA

By Jude Nwankwo
Solfa
Igbo
4 pages
41 Downloads
Offertory Hymns Hymns Consecration
0 0

More lyrics you may want