(Off) Chineke Onyenwem - Ali Okoro by Alir Okoro, Onyinyechi C — Lyrics

Alir Okoro, Onyinyechi C Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Chineke Onyenwem, nara onyinye m o, Obi dị mma ka m jiri bịanu n'ihu Gị, gọzie m o. VERSE 1 Ahụike, Gị nyere m ya, Ndụ m o, Gị nyere m, Daalụ O Nna daalụ, daalụ O Nna. Ụba m o, Gị nyere m ya, Ụlọ m o, Gị nyere m, Daalụ O Nna daalụ, daalụ O Nna. VERSE 2 Nne m o, Gị nyere m ya, Nna m o, Gị nyere m, Daalụ O Nna daalụ, daalụ O Nna. Nwa m o, Gị nyere m ya, Ụmụ m o, Gị nyere m, Daalụ O Nna daalụ, daalụ O Nna. VERSE 3 Mmiri, Gị nyere m ya, Ọkụ, Gị nyere m, Daalụ O Nna daalụ, daalụ O Nna. Anyanwụ, Gị nyere m ya, Ọnwa, Gị nyere m, Daalụ O Nna daalụ, daalụ O Nna. VERSE 4 Ego m o, Gị nyere m ya, Ọrụ, Gị nyere m, Daalụ O Nna daalụ, daalụ O Nna. Ọlụ m o, Gị nyere m ya, Egwu, Gị nyere m, Daalụ O Nna daalụ, daalụ O Nna.

Download the sheet music

(Off) Chineke Onyenwem - Ali Okoro

(Off) Chineke Onyenwem - Ali Okoro

By Alir Okoro, Onyinyechi...
Solfa
Igbo
1 page
7 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want