Full Lyrics
REFRAIN
Naranu, Chineke, achicha na mmanya anyi n'enye Gi.
Nara aja anyi, Chukwu maara obi anyi,
Biko nara ya, gozie!
Chukwu mar'obi anyi, biara n'uju, maka mgbaputa,
I biara n'uju, Chineke, gbaputa mmadu, n'uju ebere Gi,
Onyenw'anyi. Nara aja anyi, dika nke Abel.
VERSE 1
Mgb'anyi bu mmadu tufuru adi nma anyi na Gi, site n'inupu isi, Dinwenu, I hapughi anyi n'ochichi nke onwu. Nna, nara, gozie.
VERSE 2
N'ihi na I ji ebere enyere mmadu nile aka, ka o g'abu, Chineke, mgbe ha chowara Gi, ha achota Gi. Nna nara, gozie.
VERSE 3
Ugboro ugboro, Chineke, ka I nyere ndi mmadu oghere Ogbugba ndu. I biara site n'onu ndi amuma, kuziere ha itu anya nzoputa. Nna nara, gozie.
VERSE 4
I hur'uwa n'anya nke ukwu, O Nna di Nso, nke na mgbe oge ruru, I ziteer'anyi s'otu Nwa Gi ka Onye nzoputa. Nna nara, gozie.