Bia Jaa Ya Mma by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Chet' ihe nile Chineke Nna n'emere gị ee, bịa jaa ya mma. Ị nụgo? Bịa kele ya doo. Chet' ọlụ nile Chineke Nna n'alụlụ gị ee, bịa jaa ya mma. Ị nụgo? Bịa kele ya doo. Bute onyinye gị bịa n'altar ka ị kele. Ahụike nile Chineke Nna ji gọzie gị ee, bịa jaa ya mma. Ị nụgo? Bịa kele ya doo. Chet' ọrịa nile Chineke Nna n'agwọ nụ gị ee, bịa jaa ya mma. Ị nụgo? Bịa kele ya doo. Ya n'oge rugo. VERSE 1 Ma k'a kunyeba Chineke nyere gị bịa jaa ya mma. Mgbe ị gụkọsịrị ngozi Chineke, ị bịawa tuoro ya mma, Maka ngozi Chineke bịa tuoro ya. Onyinye obi ọcha ka Chineke n'anara. O nwanne m, were onyinye gị tuoro ya mma mma. VERSE 2 Onyinye Chineke n'enye ụmụ ya, Ọ bụ ka amara Chineke baa r'ụba n'ebe ụmụ ya nọ. Ngozi Chineke bụ ya n'edu gị n'ime ndụ gị ezi nwanne m, Kele ya bịa. Onyinye Chineke, onyinye. VERSE 3 Nye Chineke onyinye, onyinye, Onyinye dị mma k'anyị bunye Chineke Nna. Ihe ọma nile si n'aka Chineke Nna, Ngozi nile si n'aka Chukwu Nna, Amara nile si n'aka Chukwu Nna, Ọmụmụ nile si n'aka Chineke, Akụ n'ụba nile si n'aka ya. Bịa nunye Chineke onyinye dị mma k'anyị bunye Chineke Nna, Ọcha n'ọ dị mma.

Download the sheet music

Bia Jaa Ya Mma

Bia Jaa Ya Mma

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
4 pages
26 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want