Full Lyrics
[CHORUS]
Bulie Y'elu tuo Y'Igwe oh o n'eme mma eh
O bu Ezeora
Bia nu soro mu nye Chukwu ekele bulie Ya elu eh
n'obuo Ezeora
Chi n'eme mma eh Ababa Nna ndewo eh
na'r'ekele moh eh
Ababa Nna ndewo eh
ih'I mere dianyi mma eh
Ababa Nna ndewo eh
ya kam ji n'ekele
Ababa Nna ndewo eh
[VERSE 1]
Ekulirim ura n'ututu lelie anya n'eligwe were
si Okaka Onyeukwu ndewo eh
O wee si m nwam bu n'obi kunite
riwe ngozi si n'igwe m wee si Ya Nna
Ababa Nna ndewo eh
[VERSE 2]
O burugodu n'uwa asighim kowa ihe Chukwu n'emere m'oh
a ga m'etiwe mkpu n'okeolu were kwusaba idi mma Chukwu.
Umunnem bia nu ka m koba ihe Chukwu n'emere m'oh
iheo mere m ji asi ya Ababa Nna ndewo eh
[VERSE 3]
Kemgbe m lechara iheo mao n'eme n'ezie obi di m'uto
iheo m'omere n'agba m'anya mmiri
Nna ndewo eh
Umu Chineke le ndi iheoma na adi mma
soro m ka anyi jee si Chineke
Ababa Nna ndewo eh